Aha Ótútú Kenjọ n’Igbo: Usoro Lingwistik Antụrọpọlọjii

Main Article Content

Abstract

Aha ótútúna-abụkarịezi aha e ji egosịihe mmadụmepụtara, akaọrụ, ogoogo, ahụmụụwa, na ezi ihe ndịọzọ. Ma mgbe ụfọdụ, ndịIgbo na-aza aha otutu dịnjọ. Edeela ọtụtụedemede gbasara aha onwe, aha echimechina aha otutu kemma, mana edemede maka aha otutu kenjọababeghi ụbara. Nke a mere ọrụnchọcha a ji leba anya n’ụdịrịaha otutukenjọdịichiiche ndịIgbo na-aza. E mere nke a ka e wee mata ụdịrịaha kenjọndịIgbo na-aza, ebụmnuuche ndịna-aza aha ndịa, nakwa etu ọhaobodo si elegara ndịna-aza aha ndịa anya. Tiori e jiri mee nchọcha a bụTiori ke ejirimara onwe. E nwetara ngwe e ji mee nchọcha a site namgbanjụọnụe mere mmadụiri na abụọgụnyerendịokenye nwoke asatọna ndịokenye nwaanyịanọgbara afọ45 ruo afọ65. Ndịosonọọru a bụcha ndịIgbo si na Steeti Igbo dịka Imo, Anambara, Enugwu na Abịa. Achọpụtara ụdịrịaha otutu kenjọatọ:aha gbadoro ụkwụn’anụmanụọjọọ, aha gbadoro ụkwụn’ihe mmụọ, na aha gbadoro ụkwụn’ihe mmadụpụrụime. Ebụmnuuche ndịna-aza aha ndịa bụịkụnye ndịọzọegwu ka ana-asọha aso n’obodo. Ọhaobodo anaghịele ndịna-aza aha ndịa anya ọma; a na-ahụta ha dịka ndịna-agwọajọọgwu, ndịna-eme όkòrόna ndịarụrụala. N’ihi nke a, a na-eze ha eze ma na-akwanyekwara ha ugwu n’obodo. N’agbanyeghi na aha otutu pụrụịdịnjọ, ọna-enye aka igosi ihe mmadụbụn’ezie.

Article Details

Section
Articles