Privacy Statement

Jọnalụ a anaghị anakọta ozi nkeonwe (private information). Data niile a natara gbasara jọnalụ a bụ naanị udịrị deta a na-anabata na jọnalụ ndị ọzọ dị ka ya. Ụfọdụ nʻime ndị a bụ aha mmadụ, akara oziikuku (email address) nakwa ụlọọrụ maọbụ ụlọakwụkwọ onye ahụ si. Ozi ndị a bụcha ozi ndị gbara elu nʻamasaịba nakwa ama ndịọzọ. Ndịnchịkọba Ugegbe anaghị ere d ata ọbụla mmadụ tinyere nʻUgegbe maọbụ iji gụ Ugegbe. Ndịnchịkọta Ugegbe enweghi iwu ji ha ma mmadụ hụ aha, akara oziikuku onyeonye maọbụ ihe ndị ọzọ mmadụ tinyere nʻama Ugegbe.