Edemede a bụ inyere ndịodee aka hazie edemede ha maka izitere ya ndị na-ebipụta Ugegbe. Biko gbaa mbọ gụdaruo edemede a ala tupu ị zitere anyị edemede gị. Anyị agaghị anabata edemede ndị esoghi usoro anyị wepụtara ebe a.

Etu Edemede Ga-Aha:
Edemede agaghị agafe ihuakwụkwọ iri na asatọ. Nke a gụnyere nrụtụaka na edensibịa. Fọntị edemede ga-abụ Times New Roman 12. Ohere ahịrị (line spacing) ga-abụ 2.0.

Onye Nwe Ọrụ:
Edemede niile ga-abụ nke nchọcha dị na ya bụ nke odee ma bụrụkwa ọrụ e bipụtabeghi ebe ọzọ. Ọ bụrụ na ndị mbipụta Ugegbe achọpụta na odee sekọọrọ ọrụ onye ọzọ n’uju maọbụ na mkpirisi, maọbụ na odee zitere edemede e bipụtarala ebe ọzọ, ndịnchịkọta Ugegbe ga-ewepụ edemede dị etu a ma machibido odee ahụ izite edemede maka mbipụta n’Ugegbe n’ọdịnihu.

Ndezi Edemede:
Ndịnchịkọta Ugegbe na-ezipụ edemede niile ha natara ka ndị ọkammụta ndị ọzọ tụlee ha n’ụdị ntule ibe (peer review). Anyị na-ekpuchi aha odee tupu e zipụ edemede ya ka ndịntụle hapụ ịma onye dere edemede ha na-atụle. Ndịndezi Ugegbe nwere ike ịjụ edemede ma ọ bụrụ na ndịntụle ibe egosi na edemede ahụ riri mperi nke bụ na o kwesighi mbipụta n’Ugegbe. Odee enweghị ohere ịrụ ụka ma ọ bụrụ na a nabataghị edemede ya.

Nchịkọta Edemede Gị:
Edemede niile ga-eru ndịnhazi Ugegbe aka n’ụdị Microsoft Word.
Edemede niile ga-enwe ihe ndị a:
a. Isiokwu (title)
b. Aha (ndị)odee na ebe ha nọ dịka aha mahadum maọbụ ụlọọrụ
c. Akara oziikuku (email address)
d. Ụmịedemede nke agaghị akarị mkpụrụokwu narị abụọ na ise
e. Ọkpụrụkpụ okwu (keywords)
f. Ahụ edemede (main text)
g. Edensibịa

Edensibịa ga-adịrị n’usoro a:
1. Ahanna (ndị)odee. A ga-eru mmadụ iri tupu e tinyewe et. al
2. Afọ mbipụta
3. Isiokwu edemede (title of the paper or book)
4. Aha jọnalụ
5. Nọmba mbipụta (Volume number)
6. Ndị mbipụta na ebe ha nọ (Book publisher and location)
7. Nọmba izizi na ikpeazụ nke edemede (First and last page numbers, or article
number)

Ikike Mbipụta:
Site n’izitere ndịnchịkọta Ugegbe edemede, odee enyele ndịmbipụta Ugegbe ikike ibipụta edemede ahụ. Odee kwekwara na o nwee etu edemede ya siri megide iwu ala ọbụla, iwu ejighi ndị na-ebipụta Ugegbe, kama iwu dị etu a ji naanị odee zitere edemede ahụ.

Izite Edemede:
Edemede niile ga-aga n’akara ozionye: admin@uwandiigbo.org