Gbasara Jọnalụ Ugegbe


Ugegbe: Jọnalụ Ụwandịigbo bụ jọnalụ mbụ e dere naanị nʻasụsụ Igbo. Jọnalụ a nọ ọnọdụ ka ọ bụ mkpokọta mbọ niile ndị òtú Ụwandịigbo na-agba ịhụ na asụsụ Igbo ruru ebe asụsụ mba ụwa ndị ọzọ ruru. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na mkpụrụ dị na ya bụ ụkwa a na-apị kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ Ụwandịigbo malitere.


Edemede ndị pụtara na mbipụta nke mbụ a bụ edemede ndị e hiri asaa nʻanya were họpụta site nʻọtụtụ edemede ndị ọkammụta si mahadum dị iche iche nʻụwa niile gụpụtara nʻọgbakọ zuzugbe izizi nke Ụwandịigbo nke e mere nʻafọ 2020. Ndị òtú ndezi Ugegbe gbara mbọ hụ na edemede niile dị na mbipụta a bụ nke ndịọkammụta nʻasụsụ Igbo tulere nke ọma ma kwere na ha zuru oke, na nchọcha gbara elu na ha, nakwa na ha bụ edemede na echiche ọhụrụ nke ga-enyere agụmagụ Igbo aka.


Ndịndezi na-ekele ndịodee niile wepụtara oge ha were zite edemede ha. Anyị na-ekelekwa ndị niile nyere aka nʻịtụle edemede ndị ahụ niile nʻụdị ntụle ibe, maka na a sị e kelee onye nyụrụ ahụrụ, si kelekwaa onye nụrụ isi ya. Mana ụkpa ekele anyị na-agara Mahadum Villanova bụ ndị bu ihe gbasara ibipụta jọnalụ a nʻisi, nakwa ndịnchịkọta Ụwandịigbo bụ ndị chepụtara ihe gbasara jọnalụ a ma mekwaa ka ọ dị ire.
Anyị na-atụ anya na ndị niile ga-agụ jọnalụ a ga-ahụ na ndị chịkọbara ya bụ ndị maara nke ekwe na-akụ maka na ọ bụ nwaanyị na-agwọ ogiri maara ijiji anya pịara.