Ikuzi Asụsụ Epum n’Usoro Ejije n’Ụlọakwụkwọ Sekọndịrị Nta

Main Article Content

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’ iji usoro ejije kụzie asụsụ Epum n’ogo sekọndịrị junịọ. Ya bụ nchọcha buru ụzọ kọwaa asụsụ Epum na mkpa ọ dị ọkachasị n’ebe ụmụaka na-etolite etolite nọ maka ibawanye mmasị ha n’ebe asụsụ ara nne ha dị, inwe mmụta dị elu n’agumakwụkwọ gbasara asụsụ epum ha, inweta ọrụ nakwa inwe ezi mmekọrịta na ọganihu obodo ọkachasị n’ala Naịjirịa. A kọwara usoro iji ejije kụzi asụsụ epum na klasị dịka nke na-enye aka ịkwalite ịnụọkụnobi, ikwupụta okwu, na icheta ihe/okwu asụsụ epum nwata nụrụ n’echefughị ya ọsọ ọsọ. Ndị nchọcha mere ntulegharị agụmagụ n’ịmụ asụsụ n’usoro ejije, ma kpebie na iji usoro ejije akụzi asụsụ, ọkachasị n’ikụzi asụsụ epum ga-enye aka ịkwalite echiche, mmekọrịta, mbawanye ụbụrụ ịmụ asụsụ n’ebe ọmụụ nọ. Aro ndị nchọcha bụ na ndịnkụzi asụsụ Igbo ga-agba mbọ ịgbaso usoro nkụzi ejije maka ịkwalite mmasị ụmụakwụkwọ n’asụsụ Igbo, mamee ka ha sonye nke ọma n’ihe omume na klaasị. Nke a ga-enyere ha aka ịmụta asụsụ nke ọma, ma kwalite mmeta nke ọma ha n’ọmụmụ asụsụ Igbo

Article Details

Section
Articles