Ekele Dịka O Si Metụta Olundị Ndị Eha-Amufu

Main Article Content

Abstract

Ekele bụihe dịoke mkpa na ndụmmadụ, ma karịsịa na ndụndịIgbo. NdịIgbo adịghịeme ihe ọbụla ghara ibu ụzọkwee ekele. Oge na ihe niile a na-eme eme na ndụndịIgbo nwere ụdịekele ha na ya na-agakọ. Inye ekele kwesịrịmaka oge na ọnọdụọbụla na-emeghe ụzọmmekọrịta n’etiti onye Igbo na ibe ya. Ekele na ndụndịIgbo enweghi onye e meweere ya. Kama ọbụihe a tụrụanya na nwata ga-ebu ụzọenye okenye ekele. Etu ọdị, nwata na-ekele okenye, okenye na-ekelekwa nwata. Etu e si ekele ekele na okwu ndịe ji ezipụta ekele adịghịabụcha otu n’olundịniile dịn’ala Igbo. Ọtụtụngwakọrịta na mmepe dịn’obodo e nwekwalanụmmetụta ọjọọn’ebe ekele ndịIgbo dị. Ọbụnke a mere ebumnobi nchọcha a ji bụrụileba anya, ichọpụta na idetu ekele dịichiiche e nwere n’Igbo karịsịa n’olundịEha-Amufu ka e wee nwe ike ichekwa ha maka oge na agbụrụnọn’ihu. Omenchọcha gbadoro ụkwụna nghọtao nwere n’asụsụIgbo ya na olundịEha-Amufu tinyekwara ihe ndịo nwetara site n’aka ndịọgbara ajụjụọnụna n’ụfọdụakwụkwọọgụgụndịdịmkpa iji nweta ihe o ji mee nchọcha a. Ihe a chọpụta na-egosi na ọtụtụndịntoroọbịa amaghịụmụekele ọkpụndịe nweren’Eha-Amufu ebe ụfọdụndịmakwaranụha achọghịzịịdịna-ekele ekele ndịahụ. Omenchọcha na-ekwu na ọdịmkpa ka edetuo ekele ndịa ka ha ghara ifu efu ka ọgbọna-abịa n’ihu wee nwe ike ịmata ha.

Article Details

Section
Articles