Nkwụdosike Na Ọganiihu Omenala na Asụsụ Igbo: Ntụgharị Uche n’Aha n’Agụmagụ Ederede

Main Article Content

Abstract

Aha bụihe ọbụla e nyere mmadụmaọbụihe ndịọzọe ji amata ha. Ọbụotu ụzọgbara ọkpụrụkpụe nwere ike isi mee ka asụsụna omenala ndịbụrụihe kwugidesiri ike. Ọtụtụndịodee agụmagụna-eji aha akwara ngwaọrụha iji egosipụta agwa dịicheiche n’edemede ha. Nchọpụta na-egosi na ọtụtụndịodee, kama inye agwa dịn’edemede ha aha sitere n’agbụrụha, na-enye ha aha sitere n’asụsụna agbụrụndịọzọ. Ụfọdụgbaliri nye aha agbụrụha na-edebiri ya edebiri nke na mpụtara na nghọta dịn’aha ndi ahụanaghịagbazịelu. Oge ụfọdụkwa, ha na-enyekwa aha enweghịmpụtara ma ncha. Ụdịakparamagwa dịetu a kpalitere mmụọomenchọcha n’ọrụa. Ebumnobi ọrụnchọcha a bụinyocha ọtụtụaha ndịodee agụmagụIgbo a họọrọwebatara n’edemede ha, mpụtara ha, na etu aha ndịahụsi kwalite maọbụebute ọdịda asụsụna omenala Igbo. Akwụkwọndịa họọrọiji mee nchocha a gụnyere akwụkwọejije Obidiya (1977) nke Akoma, Enyinna, iduuazịIhe Onye Metara (1996) nke Ofomata, Chinedum E., Purple Hibiscus (2006) nke Chimamanda Adichie tinyekwara otu iduuazịThe Potter’s Wheel (2011) nke Ike, Chukwuemeka. Nchọpụta e nwetara na-egosi na ọtụtụndịodee ndịa nyere agwa ha aha Igbo. Aha ndi ahụnwegara mpụtara dịomimi, ma nyekwa aka n’igosipụta omenala na usoro ebimndụndụndịIgbo. Ntụtaaro omenchọcha bụna ọdịmkpa ikwadosi ndịodee ike ka ha na-enye agwa ha aha Igbo nwere mpụtara. Ha ga-agbakwa mbọna-ederukwa aha ndi ahụn’isi iji mee ka nghọta ha wee pụtazuo ihe.

Article Details

Section
Articles