Ihe Nkuzi dị N’Akụkọ Ifo Igbo Maka Nzụlite Ụmụaka

Main Article Content

Abstract

Ụmụaka dịka ome ji nke chọrọka a rọzie ya tupu ya a gahie ụzọ. Ọbụrụna a rọzighi ome ya bụji, site n’itinyere ya osisi e ji amali ji nke ga-enyere ya aka ịkwụakwụnakwa iru nne, ọgaghịeme nke ọma. Otu a ka ọdịn’ebe iji akụkọifo azụlite ụmụaka dị. Ka nwata na-eto, o nwere ụmụagwa e kwesịrịka akụnye n’ime nwata ahụnke sitere n’akụkọifo. Ihe ndịahụe kwesịrịịkụziri nwata site n’akụkọifo gụnyere: ezi akparamagwa, ikwu eziokwu, inwe umeala, ihụmmadụibe ya n’anya, inyere mmadụaka na ndịọzọ. Sitekwa n’akụkọifo, a na-akụziri ụmụaka ihe bụakwụmụgwọajọomume dịicheiche na ihe butere ọnọdụihe maọbụakparaamagwa ya. Ihe nkuzi ndịa na-eme ka nwata nọrọna nche iji gbalahụakparamagwa ọjọọna ntaramahụhụso ya. Ma,ọna-abụihe ịtụnanya na mgbagwoju anya na ndịnne na nna nakwa ndịnkuzi anaghịakọziri ụmụaka akụkọifo ma n’ụlọma n’ụlọakwụkwọ.Anyịsiri n’akụkọifo ole na olewepụta ihe nkuzi ndịa anyịkwuru maka ha, nke ga-enye aka mee ha ezi ụmụaka n’ụzọuto ha bịa mezie ha ndịezi mmadụn’obodo, ndịga-achịọchịchịn’ụzọdịmma. Atụtụanyịgbasoro mee nchọcha bụnke Piaget na Kohlberg. Atụtụa na-akọwa na oge nwata dịn’agbata afọabụọna afọasaa ka e nwere ike ịkụziri ya ihe niile a chọrọka ọmata n’ihi na oge a,ụbụrụya dịezigbo nkọ. Edemede a na-akpọoku na-asịka e tinye akụkọifo na ntụpụta kọrịkụlọm agụmakwụkwọmalite n’ụlọakwụkwọỌtaakara rukwaa n’ụlọakwụkwọMahadum. Na-asịkwa ka ndịnne na nna jisie ike na-akọrọụmụha akụkọifo n’ihi a na-esi n’ụlọmara mma pụwa ama.

Article Details

Section
Articles