Ịhazigharị Mmemme Alụmalụ Ndịigbo

Main Article Content

Abstract

Imirikiti obodo na-ahazigharịomenala gbasara ijikọnwoke na nwaanyịn’alụmalụ. Mmemme na-eso alụmalụna-atọzịndịmmadụákwà n’úkwù. Okoro gụchaa akwụkwọ, ọgaghịenwete ọrụ. O nwee ihe ọna-arụ, ọgaghịakpata ego ga-ezu iji lụọnwaanyị. Ya mere na Ndiigboga-ahazigharịomenala alụmalụka umunwoke na ụmụnwaanyịna-alụdi na nwunye n’oge, mee ihe dịara ha n’oge, ma nwe ohere were akụnụba ha kpara na ntorobịa kporie ogologo ndụn’okenye. Edemede à na-elebenye anya n’ihe gbasara alụmalụna ndụNdiigbo:ịhazi usoro alụmalụsite n’ịhụnwaanyị, ịkụakan’ụzọ, wee rue mgbe nwoke na nwaanyi ga-ebido biwe ndụka di na nwunye; ịhazigharịitu ngọma kachapụ‘ime ego,’‘ịkwụụgwọnwaanyị,’ maọbụ‘ịkpa akụnwaanyị’; iwepu omenala ndịmba ọzọna-abata n’alụmalụIgbo dịka nwoke isekpu àlà rịọnwaanyịka ọlụwa ya, ịgbanye ọla ibedo (ọla mkpịsịaka), mmemme eyimuweọcha n’ụlọụka; naiwere ịgbankwụdịka mmemme alụmalụIgbo,nakwa ịhazi ya ka ọbụrụnaanịemume alụmalụikpeazụtupu nwoke na nwaanyịebiri ka di na nwunye.

Article Details

Section
Articles