E Nwere Iduuazị Ụmụaka N’Igbo?

Main Article Content

Abstract

O nweghị isi arụmarụ dị na ya na n’ala Igbo, o bu site n’akụkọ ifo ka a na-esi ezi ụmụntakịrị ihe. N‘agbanyeghị ụdị akụkọ ifo ọ bụ, e nwere ihe ndị dị iche n’akụkọ ifo na-eme ka ọ bụrụ ezigbo ụzọ e ji a zụlite ụmụaka. Mana e lemaa anya, anyị ga-ahụ na ụdị ọnọdụ na-akpata ka ụmụaka nọkọọ nụ akụkọ ifo adizighi ugbu a. O bu ezie na F.C. Ọgbalụ kpokatara ụfọdụ akụkọ ifo ọnụ, ọbụnadị ndị gbasara mbekwu, wee dee Mbediọgụ: AkọbụDike, anyị nwere ike ịsị na ebuchaghị naanị ụmụaka n’obi wee dee akwụkwọ ahụ. Keduzie maka iduuazi ndi dikà Omenuko nke Pita Nwana dere na Ala Bingo nke D.N. Achara dere? Iduuazị ndị a etoghi oke ogologo, nke mere ka ọ dị ka a ga-asị na e dere ha maka ụmụaka. Ihe akụkọ ndị a na-ako di omimi karịa mkpa ụmụntakịrị, ma asị kwuo. Isiokwu: Gịnị kpatara na e nweghị iduuazị n’asụsụ Igbo nke ụmụaka naanị nwere ike ịgụ? Ọ bụ na ndị odeakwụkwọ na-eche na ụmụaka erubeghị ịgụ iduuazị ọbụla, ka ọ bụ na ọ bụ naanị akụkọ ifo ka anyị chere bụ ụdị akụkọ kwesịrị ha ịgụ? Mana ajụjụ ọzọ bukwa, kedu ihe ndị Igbo chere bu ezigbo iduuazị, ọbụna nke e dere maka ụmụaka? Okwu nnyocha m ga-eleba anya n’ajụjụ ndị a ma lebakwa anya na etu anyị ji ahazi ịkọakụkọ na iduuazị Igbo.

Article Details

Section
Articles